3“Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba.
4Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri.”
5Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!
6Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya!
7Ọ dị nwoke nwere nwaagbọghọ o kwere nkwa na ọ ga-alụ? Ya laa, gaa lụọ nwanyị! Nʼihi na ọ bụrụ na ọ nwụọ nʼagha, nwoke ọzọ ga-alụ ya.”