Diuteronomi 20

Ọ dị nwoke nwere nwaagbọghọ o kwere nkwa na ọ ga-alụ? Ya laa, gaa lụọ nwanyị! Nʼihi na ọ bụrụ na ọ nwụọ nʼagha, nwoke ọzọ ga-alụ ya.”

Deuteronomy 20:7 (UKJV) And what man is there that has betrothed a wife, and has not taken her? let him go and return unto his house, lest he die in the battle, and another man take her.

5Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!

6Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya!

7Ọ dị nwoke nwere nwaagbọghọ o kwere nkwa na ọ ga-alụ? Ya laa, gaa lụọ nwanyị! Nʼihi na ọ bụrụ na ọ nwụọ nʼagha, nwoke ọzọ ga-alụ ya.”

8Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ahụ ga-ekwukwa sị, “Ọ dị onye egwu na-atụ? Ọ bụrụ na o nwere onye ụjọ na-atụ, ya laghachi nʼụlọ ya ka ịtụ ụjọ ya hapụ ijide ndị ọzọ.”

9Mgbe ndịisi agha gwachara ndị agha ha okwu ndị a, ha ga-ahọpụta ndịisi ga-achịkọta usuu ndị agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.