25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.
26Ekwuru m na m ga-achụsasị ha, hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ.
27Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi, ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị, ‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri, ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ”
28Ha bụ mba na-enweghị uche, ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha.
29A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.