Diuteronomi 32

Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?

Deuteronomy 32:6 (UKJV) Do all of you thus requite the LORD, O foolish people and unwise? is not he your father that has bought you? has he not made you, and established you?

4Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke, ụzọ ya niile ziri ezi. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.

5Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya, ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe

6Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?

7Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga, tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị. Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya.

8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.