5Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya, ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe
6Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?
7Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga, tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị. Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya.
8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị.
9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya.