Diuteronomi 33

Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu, nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume, ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri, site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.”

Deuteronomy 33:19 (UKJV) They shall call the people unto the mountain; there they shall offer sacrifices of righteousness: for they shall suck of the abundance of the seas, and of treasures hid in the sand.

17Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ, mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa. Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa. Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị otu a ka imerime puku ndị Manase dị.”

18Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị.

19Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu, nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume, ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri, site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.”

20Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi.

21Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.