5Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun, mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ ha na ebo niile nke Izrel.
6“Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ, ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.”
7Ihe a ka o kwuru banyere Juda, “Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda, kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ. Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche. Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.”
8Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba.
9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị, ‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’ Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara, ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya. Ma o debere okwu gị, cheziekwa ọgbụgba ndụ gị.