3Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m.
4Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”
5Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?”
6Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.
7Eze biliri ọtọ nʼiwe, hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na ọ maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi.