2mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.”
3Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m.
4Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”
5Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?”
6Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.