Esta 7

Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.

Esther 7:6 (UKJV) And Esther said, The adversary and enemy is this wicked Haman. Then Haman was afraid before the king and the queen.

4Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”

5Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?”

6Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.

7Eze biliri ọtọ nʼiwe, hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na ọ maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi.

8Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.