Ọpụpụ 15

Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.

Exodus 15:13 (UKJV) You in your mercy have led forth the people which you have redeemed: you have guided them in your strength unto your holy habitation.

11Onye dịka gị Onyenwe anyị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube?

12“I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile.

13Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.

14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị.

15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.