12“I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile.
13Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.
14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị.
15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;
16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.