Ọpụpụ 15

oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.

Exodus 15:16 (UKJV) Fear and dread shall fall upon them; by the greatness of yours arm they shall be as still as a stone; till your people pass over, O LORD, till the people pass over, which you have purchased.

14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị.

15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;

16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.

17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.

18“Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.