26Mgbe i wepụtara obi ebule ahụ e ji doo Erọn nsọ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ọ ga-abụkwa oke nke gị.
27“Doo akụkụ ebule ido nsọ ahụ nsọ, ndị nke bụ oke Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, obi ya e fufere efufe na apata ya e chere nʼihu Onyenwe anyị.
28Nke a ga-abụ oke Erọn na ụmụ ụmụ ya ga-eketa dịka ụkpụrụ mgbe ebighị ebi nʼaka ndị Izrel. Mgbe niile ọbụla ha na-achụ aja udo maọbụ aja ekele, ka nke a bụrụ onyinye ụmụ Izrel na-enye Onyenwe anyị site nʼaja ha.
29“Uwe nsọ Erọn ndị a niile ka a ga-edebe nʼihi mmemme ido nsọ. A ga-eji ha na-edo ụmụ ya nsọ bụ ndị ga-anọchi anya ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
30Nwa ya nwoke ọbụla nke nọchiri anya ya dịka onye nchụaja, nke bịara nʼụlọ nzute m ije ozi nʼEbe Nsọ ga-eyi uwe ndị a ụbọchị asaa.