28Nke a ga-abụ oke Erọn na ụmụ ụmụ ya ga-eketa dịka ụkpụrụ mgbe ebighị ebi nʼaka ndị Izrel. Mgbe niile ọbụla ha na-achụ aja udo maọbụ aja ekele, ka nke a bụrụ onyinye ụmụ Izrel na-enye Onyenwe anyị site nʼaja ha.
29“Uwe nsọ Erọn ndị a niile ka a ga-edebe nʼihi mmemme ido nsọ. A ga-eji ha na-edo ụmụ ya nsọ bụ ndị ga-anọchi anya ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
30Nwa ya nwoke ọbụla nke nọchiri anya ya dịka onye nchụaja, nke bịara nʼụlọ nzute m ije ozi nʼEbe Nsọ ga-eyi uwe ndị a ụbọchị asaa.
31“Were anụ ebule ido nsọ ahụ, sienụ anụ ahụ nʼebe dị nsọ.
32Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri anụ ebule ahụ, na achịcha ndị ahụ dị nʼime nkata nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.