Ọpụpụ 31

Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”

Exodus 31:11 (UKJV) And the anointing oil, and sweet incense for the holy place: according to all that I have commanded you shall they do.

9na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.

10Na uwe ọma ahụ akpara akpa, ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja.

11Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”

12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,

13Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.