Ọpụpụ 31

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,

Exodus 31:12 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

10Na uwe ọma ahụ akpara akpa, ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja.

11Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”

12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,

13Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.

14“ ‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.