11Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”
12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,
13Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.
14“ ‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ.
15Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ.