8Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya.
9Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.
10Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,
11nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
12Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti.