Ọpụpụ 39

Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.

Exodus 39:9 (UKJV) It was foursquare; they made the breastplate double: a span was the length thereof, and a span the breadth thereof, being doubled.

7Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

8Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya.

9Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.

10Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,

11nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.