9Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.
10Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,
11nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
12Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti.
13Nʼahịrị nke anọ bụ: nkume topaazi, ọniks na jaspa. Ahịọnyere ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.