15“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Taịa, Ọ bụ na agaghị anụ mkpọtụ ọdịda gị na mba ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri, mgbe ndị e merụrụ ahụ ga na-asụ ude nʼoge a na-egbu ndị bi nʼime gị?
16Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị.
17Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị, “ ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a maara aha ya, nke ndị na-ejegharị nʼosimiri bi nʼime ya. Na mbụ, ị bụ obodo nke ịdị ike ya pụtara ihe nʼosimiri niile, gị na ndị bi nʼime gị. Ị na-emenyekwa ndị bi nʼime ya egwu.
18Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri na-ama jijiji nʼihi ọdịda gị. Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obi nʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’
19“Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị,