13Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha.
14Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.
15A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.
16Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
17“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.