Izikiel 3

“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.

Ezekiel 3:17 (UKJV) Son of man, I have made you a watchman unto the house of Israel: therefore hear the word at my mouth, and give them warning from me.

15A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.

16Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,

17“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.

18Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.

19Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.