Izikiel 3

Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,

Ezekiel 3:16 (UKJV) And it came to pass at the end of seven days, that the word of the LORD came unto me, saying,

14Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.

15A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.

16Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,

17“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.

18Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.