3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
5Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
6Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.