2“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
5Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
6Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.