4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
5Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
6Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.
8Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya