1O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.