13Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile, nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi. Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ.
14Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha, na-asọkwa dịka mmanụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.
15Mgbe m bibiri Ijipt, kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya, mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
16“Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
17Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị,