1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị ọzụzụ atụrụ Izrel niile, buo amụma sị ha, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ahụhụ na-adịrị unu ndị ọzụzụ atụrụ Izrel, ndị na-enyeju naanị onwe ha afọ. Ọ kwesighị ka onye ọzụzụ atụrụ lekọtazie igwe atụrụ e tinyere nʼaka ya anya?
3Unu na-eri abụba ha niile, unu na-eyi uwe ajị anụ, na-egbu anụ ndị mara abụba nʼagbanyeghị na unu adịghị elekọta igwe ewu na atụrụ m ndị a.
4Unu anaghị eme ka ndị na-adịghị ike dị ike, maọbụ gwọọ ndị na-arịa ọrịa, maọbụ kechie ọnya ndị merụrụ ahụ. Unu adịghị akpọghachite ndị kpafuru akpafu, maọbụ pụọ ịchọ ndị furu efu. Kama naanị aka ike ka unu ji na-achị ha.
5Nʼihi ya, ha agbasasịala nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ anọghị ya. Ha aghọkwaarala anụ ọhịa niile ihe oriri.