Izikiel 45

“ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu.

Ezekiel 45:1 (UKJV) Moreover, when all of you shall divide by lot the land for inheritance, all of you shall offer an oblation unto the LORD, an holy portion of the land: the length shall be the length of five and twenty thousand reeds, and the breadth shall be ten thousand. This shall be holy in all the borders thereof round about.

1“ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu.

2Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya.

3Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.