Izikiel 48

Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere.

Ezekiel 48:11 (UKJV) It shall be for the priests that are sanctified of the sons of Zadok; which have kept my charge, which went not astray when the children of Israel went astray, as the Levites went astray.

9“Ogologo ebe a ewepụtara iche nye Onyenwe anyị ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara.

10Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ Onyenwe anyị ga-adị nʼetiti ya.

11Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere.

12Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala.

13“Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị Livayị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.