11Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere.
12Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala.
13“Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị Livayị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara.
14O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye Onyenwe anyị.
15“Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya,