Izikiel 48

O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye Onyenwe anyị.

Ezekiel 48:14 (UKJV) And they shall not sell of it, neither exchange, nor alienate the first-fruits of the land: for it is holy unto the LORD.

12Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala.

13“Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị Livayị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara.

14O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye Onyenwe anyị.

15“Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya,

16nke ogologo akụkụ ugwu ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ndịda ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ ruru kilomita abụọ na ụma anọ, na akụkụ ọdịda anyanwụ rukwara kilomita abụọ na ụma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.