18A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.
19Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma.
20Ndị si nʼikwu Imea bụ Hanani, na Zebadaya.
21Ikwu Harim: Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya.
22Ndị si nʼikwu Pashua: Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa.