Ezra 3

Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya.

Ezra 3:7 (UKJV) They gave money also unto the stone workers, and to the carpenters; and food, and drink, and oil, unto them of Zidon, and to them of Tyre, to bring cedar trees from Lebanon to the sea of Joppa, according to the grant that they had of Cyrus king of Persia.

5Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha chụrụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ mgbe niile, na nke aja maka ọnwa ọhụrụ, na aja ndị ọzọ maka mmemme ndị ọzọ dị nsọ a kara aka nke Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja onyinye nke ha ji nye Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu.

6Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

7Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya.

8Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị.

9Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.