Ezra 3

Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị.

Ezra 3:8 (UKJV) Now in the second year of their coming unto the house of God at Jerusalem, in the second month, began Zerubbabel the son of Shealtiel, and Jeshua the son of Jozadak, and the remnant of their brethren the priests and the Levites, and all they that were come out of the captivity unto Jerusalem; and appointed the Levites, from twenty years old and upward, to set forward the work of the house of the LORD.

6Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

7Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya.

8Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị.

9Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ.

10Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto Onyenwe anyị dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.