Ezra 5

Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha.

Ezra 5:10 (UKJV) We asked their names also, to certify you, that we might write the names of the men that were the chief of them.

8Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha.

9Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?

10Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha.

11Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị: “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga.

12Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.