6Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs:
7Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee, Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a, Anyị ekelee gị.
8Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha.
9Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?
10Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha.