Ezra 9

Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait.

Ezra 9:1 (UKJV) Now when these things were done, the princes came to me, saying, The people of Israel, and the priests, and the Levites, have not separated themselves from the people of the lands, doing according to their abominations, even of the Canaanites, the Hittites, the Perizzites, the Jebusites, the Ammonites, the Moabites, the Egyptians, and the Amorites.

1Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait.

2Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.”

3Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m, dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.