Ezra 9

Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’

Ezra 9:12 (UKJV) Now therefore give not your daughters unto their sons, neither take their daughters unto your sons, nor seek their peace or their wealth for ever: that all of you may be strong, and eat the good of the land, and leave it for an inheritance to your children for ever.

10“Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị,

11nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.

12Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’

13“Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ.

14Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.