Ezra 9

nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.

Ezra 9:11 (UKJV) Which you have commanded by your servants the prophets, saying, The land, unto which all of you go to possess it, is an unclean land with the filthiness of the people of the lands, with their abominations, which have filled it from one end to another with their uncleanness.

9Nʼihi na ndị ohu ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem.

10“Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị,

11nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.

12Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’

13“Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.