Jenesis 19

Mgbe ha si nʼime obodo kpọpụta ha, otu onye nʼime ha gwara ha sị, “Gbalaganụ nʼihi ndụ unu. Unu elekwala anya nʼazụ. Unu akwụsịkwala ebe ọbụla na mbara ala. Gbaganụ nʼugwu, nʼihi na ọ bụrụ na unu emeghị otu a, a ga-ekpochapụ unu.”

Genesis 19:17 (UKJV) And it came to pass, when they had brought them forth abroad, that he said, Escape for your life; look not behind you, neither stay you in all the plain; escape to the mountain, lest you be consumed.

15Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.”

16Mgbe Lọt ka nọ na-eche ihe ọ ga-eme, ndị ikom ahụ jidere ya nʼaka, jidekwa nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ duru ha pụọ nʼobodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼebe ha nọ.

17Mgbe ha si nʼime obodo kpọpụta ha, otu onye nʼime ha gwara ha sị, “Gbalaganụ nʼihi ndụ unu. Unu elekwala anya nʼazụ. Unu akwụsịkwala ebe ọbụla na mbara ala. Gbaganụ nʼugwu, nʼihi na ọ bụrụ na unu emeghị otu a, a ga-ekpochapụ unu.”

18Ma Lọt sịrị ha, “Mba, ndị nwe m, bikonu,

19ohu unu achọtala amara nʼihu unu, unu egosila m obi ebere dị ukwuu site nʼichebe ndụ m. Ma agaghị m enwe ike gbalaga nʼugwu ka mbibi a ghara ịdakwasị m, m nwụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.