23Mgbe Lọt rutere obodo Zoa, anwụ awalitela nʼala ahụ.
24Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke Onyenwe anyị mere ka o si nʼeluigwe zoo.
25Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala.
26Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu.
27Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga.