24Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke Onyenwe anyị mere ka o si nʼeluigwe zoo.
25Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala.
26Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu.
27Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga.
28Ọ lepụrụ anya nʼebe obodo Sọdọm na Gọmọra dị, na nʼebe mbara ala ndị ahụ niile dị. Ọ hụrụ anwụrụ ọkụ dị ukwuu nke si nʼala ahụ na-alali elu. Anwụrụ ọkụ a dị ka anwụrụ ọkụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-enwusi ike.