26Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu.
27Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga.
28Ọ lepụrụ anya nʼebe obodo Sọdọm na Gọmọra dị, na nʼebe mbara ala ndị ahụ niile dị. Ọ hụrụ anwụrụ ọkụ dị ukwuu nke si nʼala ahụ na-alali elu. Anwụrụ ọkụ a dị ka anwụrụ ọkụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-enwusi ike.
29Ya mere, mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị na mbara ala, o chetara Ebraham, kpọpụta Lọt site nʼoke mbibi ahụ e bibiri obodo ndị ahụ Lọt bi nʼime ha.
30Emesịa, Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ hapụrụ obodo Zoa, nʼihi na ọ tụrụ egwu ibi nʼime Zoa. Ọ gara biri nʼime ọgba nkume ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ.