3Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,
4“Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”
5Ụmụ Het zara Ebraham sị,
6“Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”
7Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,