Jenesis 23

Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,

Genesis 23:7 (UKJV) And Abraham stood up, and bowed himself to the people of the land, even to the children of Heth.

5Ụmụ Het zara Ebraham sị,

6“Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”

7Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,

8sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,

9ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.