4“Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”
5Ụmụ Het zara Ebraham sị,
6“Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”
7Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,
8sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,